facebook
Bambooks
Anu-Gbaa-Ajo-Egbe
Anu Gbaa Ajo Egbe… (fable) bu utu nke m tunyere ihu na akuko ifo dika odinaala na-aga n’ihu. Aha ya, agbagwojula gi anya, niihina ebe Mbe no, elu nwere ike ikoro n’ala, onye no n’ala nwekwara ike idagbu onye no n’elu. Chete na o ka n’azu, e buru n’azu, o ka n’ihu. Nkponkpo kpokirikpo! N’ezie, anu ozo anaghi amu Mbe Ujo atula gi, ka ya bun kata ga-esi mechaa ghoro ngiga. ! mazikwa n’okwu bun ka? Nka ka ire bu so anu na eze na-acho anu o ga-ata ji ebi n’udo n’ime onu. Ma mmuonwu na-agba n’ama nwere ndi o naagbara. O bu Mbe na umuanumanu ndi ozo mejuputara ukpa akuko a; akpacha m anya jiri nnukwu mkpuruedemede were malite aha anu obula dika e si ede nke mmadu ka ha were kwuputa. N’agbanyeghi nkuzi na ikpa ochi di n’akwukwo a, a turu anya na umummadu gaaghotawanye umuanumanu, hu ha ke ekereke so nwere uwa ma kwesikwa nkwanyere ugwu n’ihe niile.
Author : Ositadimma Amakeze
Published : 2019
Classification : Book
Age Ratings : Teens(11yrs - 17yrs)
Category : Fiction
Number of Pages : 63
Ratings:
5.0/5.0
Read

You may like